Shehu Shagari: Ọnwụ akpọrọla onye bụbu onyeisiala Naịjirịa

Akụkọ dị mkpa taa:

Shehu Shagari chịrị Naịjirịa site n'afọ 1979 ruo 1983, anwụọla ka ọ rịachara obere ọrịa.

Image copyright Getty Images

Shagari dị afọ 93 oge ọ nwụrụ.

Nwa nwa ya bụ Bello Shagari, kwuputara nke a n'elu Twitter ya, ka o kwuru na ọ nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'Abuja.

Ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Bashir Ahmad kwukwara maka ọnwụ ya na Twitter ya, ebe o kwuru ka Chineke nara obi ya na ndokwa.

E jiri 'Green Revolution, ịrụ ụlọ a na-esi mmanụ agbịdị bụ 'Kaduna Refinery,' mara ọchịchị ya nke Muhammadu Buhari dịka onye agha nara ya ọkwa n'ike n' abalị 31 nke ọnwa Disemba afọ 1983.

Buharị chọrọ ka ị tụkwasị ya obi:

Ka ndị otu APC gara achụmnta vootu n'Akwa Ibom steeti, Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru maka usoro o ji achụ mpụ na nrụrụaka.

O kwuru sị "Oge m bụ onye agha, anyị na-anwụchi ndị mmadụ kpọchie maka nrụrụaka ruo oge ị gosiri na aka gị dị ọcha.

Mana ugbua m na-eyizi akwa agbada, ana m esozi ya n'usoro ọchịchị onyekwuo uche ya.

Anyị na-eme ya, anyị agaghị akwụsị. Anyị anapụtala ụlọ nakwa ego."

Ọ gara n'ihu kwuo sị "Ị gaghị ata onwe gị ụta maka ịtụkwasị anyị obi.

"Daalụ Akwa Ibom. Enweghị onye Naịjirịa ga-ata onwe ya ụta maka itunyere anyị vootu.

Anyị ga-agbado anya na nchekwa, akụnaụba obodo nakwa ibuso mpụ na nrụrụaka agha. "

N'Imo steeti,

Ndị uweojii Imo steeti anwụchiela otu nwoke a kpọrọ Uchenna Nwachukwu, bụ onye ha na-ebo ebubo maka ịtọrọ ọkaiwu Bidwell Onyekasi, n'Owere.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye a tụrụ ịga

Kọmishọna uweojii steeti ahụ bụ Dasuki Galadanchi, kwuru na onyeisi otu F-Sars bụ Geoffery Victor, nwụchiri Nwachukwu nso ụlọakwụkwọ Emmanuel College.

N'akụkọ ọzọ,

Akụkọ si obodo Baga dị na Borno steeti apụta na-akọwa na Boko Haram ewerela ọnọdụ dịka agada gbachiri ụzọ n'obodo ahụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mgbe Ndị agha turu ọnụ na ha anwụchiela Shekaụ ma ọ dị ndụ akpagharị

Akụkọ na-ekwukwa na ha buruchara ngwaagha nakwa ụgbọala ndị agha Naịjirịa ma gbaa ebe na-anọ ọkụ.

Na mba ofesi,

Mba Kongo enyela onye nnọchite Yurop abalị abụo ka o si n'ala ha pụọ.

Nke a bụ iji bọgwara otu jikọrọ mba nọ na Yurop ụbọ maka imachị ndị nọ n'ọkwa ọchịchị ndị gụnyere onyeisiala ha bụ Joseph Kabila na onye bụbụ mịnịsta ihe na-eme n'ụlọ bụ Ramazani Shadary bụ onye na na-azọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka ehighariiri.

Otu EU katọrọ nyigharị ahụ sị na o kwesịghị ekwesị.

N'akụkọ ọzọ,

Donald Trump bụ onyeisiala mba Amerịka ekwuola na ọ ga-emechi okeala jikọro Amerịka na Mekziko maọbụrụ na ụlọomeiwu jụ iwepụta ego ọ ga-eji rụọ mgbidi aja ọ chọrọ ịrụ.

Image copyright Reuters

O dere na Twitter sị "ọ ga-aka mma na anyị wuru mgbidi aja maọbụ anyị emechie okeala.

N'egwuregwu,

Ọ ga-akpọtụ akpọtụ na Premier League na satọde mgbe Liverpool ga-ezute Arsenal.

Onye ga-ezu ibe ya ike n'ahụ?

Image copyright Getty Images

Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Rivers steeti gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha anwụchiela nwoke ahụ.

Ọ sị na ọ bụ mgbe nwoke ahụ na nwunye na-ese okwu ka ọ bulitere ya bụ okwute tụọ nwaanyị ahụ mgbe ọ na-achọ ịgbalahụ di ya.

"Nwaanyị ahụ dị ime dara ma kubuo tupu enyemaka abịara ya" ka o kwuru mgbe a jụrụ ya.

O kwukwara na ozu nwaanyị ahụ dị n'ụlọozu ugbua dịka ndị uweojii na-akwado ịme nyocha chọpụta ihe gburu ya n'ezie.

Image copyright NIGERIAN ARMY

Ndị echere na ha gbaguru Alex Badeh akwọwala ihe mere ha jiri gbuo ya.

Ha kwuru na ọ bụ mgbe ha na-achọ izu nnukwu ego ha nụrụ na o bu ka ha gbagburu ya.

Mana ụlọ ntaakụkọ NAN depụtara na ezinaụlọ Badeh ekwetaghị na ya bụ akaebe.

Ha kwuru na Badeh ejizughi naịra narị ise mgbe o si n'ụlọ ya pụọ n'ụbọchị ahụ.

N'akụkọ ọzọ,

Image copyright INEC NIGERIA/FACEBOOK
Nkenke aha onyonyo PVC ndị anatabeghị

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec n'Oyo steeti ekwuola n'ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwanye ọkụ n'ike ha resi ha PVC nke ndị mmadụ anatabeghi

Mana ha kwuru na ha kwụsiri ike na ntụlịaka 2019 ga-abụ ihe kwụọtọ.

Na mba Ofesi,

Ndị na-eme ngagharị iwe n'obodo Kongo awokpola ụlọ ebe a na-agwọ ma na-enyocha ọrịa ebola.

Iwe ha bụ maka ndọtị adọtịrị ntuliaka n'ala ha dịka ngalaba na-ahụ maka ya bụ ntụlịka kwuru na ọ bụ ịgbochi ọrịa ebola mere ka ha dọtịa ya bụ ntuliaka.

N'egwuregwu,

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Serena Williams kwuru na ya na-ebu agha a maka ụmụnwanyị niile

Serena Williams bụ odogwu n'ịpịa Tennis ekwuola na ọ ga-agbado anya n'ihe dị mkpa nakwa ọdịnihu ya dịka nwanne ya nwaanyị bụ Venus Williams meriri ya n'asọmpị ha pịara na Abu Dhabi

Okwu ahụ bụ iji kọwa ihe mere mgbe Naomi Osaka meriri ya n'asọmpị US Open n'ọnwa September

Nkeji ụtụtụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla