Aisha Buhari: Buhari gara arụ karịa ma ọ bụghị nwoke abụọ

Image copyright Aisha Buhari Facebook
Nkenke aha onyonyo Nwunye Buhari na-ekwukarị uche ya n'ihe gbasara gọọmentị di ya

Ọnụ na-ekwuru nwunye onyeisiala Naijiria bụ Sulaiman Haruna, ekwuola na nne ya ukwu bụ Aisha Buhari kwuru ọtụtụ ihe dị mkpa karịa okwu ndị bụ ọgbatauhie nye di ya.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia ụbọchị Tuzde, Disemba 5, 2018, kwuru na nwunye onyeisiala gbara ama na mmadụ abụọ so n'ọchịchị Buhari bụ ọgbatauhie mere na di ya arụghị ọrụ karịa ka ọ rụrụ.

Nwunye onyeisiala kwuru na ndị kwesịrị ibuso mmadụ abụọ ahụ, ndị ọ kpọghị aha, agha na-aga n'azụ na-arịọ ha ihe.

Oge BBC kpọrọ ya n'ekwentị ịjụ ya na akụkọ ahụ na-efegharị na ọ bụ ezie, o kwuru na ya enweghị ọsịsa.

Harụna ekweghị maọbụ gọọ akụkọ ahụ.

" O nwere ọtụtụ ihe dị mkpa nwunye onyeisiala kwuru n'ọgbakọ ụmụnwaanyị e mere n'Abuja, unu bụ ndị ntaakụkọ hapụ ya na-akọ ihe ọzọ."

Dika Haruna siri kọwa n'akwụkwọ mgbasaozi o zitere BBC Igbo, nwunye onyeisiala tụrụ arịrị banyere ọnọdụ ụmụnwaanyị ndị di ha nọ n'ọgbọ ọgụ Boko Haram.

O gara n'ihu sị na Aisha Buhari rịọrọ gọọmenti ka ha lebanye anya n'ọnọdụ ụmụnwaanyị ndị ahụ n'ihi na ọ bụ ha n'anụ ụfụ di ha ịnọ n'ọgbọ ọgụ.

Buhari arịọla ndị Krọs Riva Steeti ka udo chịaa -

Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndị nwere ọgbaghara na Naịjirịa nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu ọ gawa Yobe. Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Buhari bidoro njem nleta n'obodo ndị nwere ọgbaghara na Naịjirịa nke gunyere Taraba, Plateau, Benue tupu ọ gawa Yobe.

Kwee nu ka udo chịaa n'etiti unu - Buhari

Onyeisiala Buhari etinyela ọnụ n'ọgbaghara dị n'etiti obodo ndị nọ n'okpuruọchịchị Biase nke dị na Krọs Riva steeti bụ nke tarala isi ọtụtụ mmadụ.

N'ozi si n'aka onye enyemaka ya bụ Garba Shehu, Buhari rịọrịọ ndị obodo ndị a ka ha kwe ka udo chịwa n'etiti ha.

Akụkọ kwuru na ọgbaghara a dị n'etiti obodo Urugbam, Egbor, Ipene na Abanwan bụ maka ịzọ oke ala gbara ha gburu gburu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye nta akụkọ BBC banyere na ọgbọ ọgụ ndị Izzi na Ukelle. kirie ihe ọ hụrụ

Uche Nwose eferela APC aka

Uche Nwosu abaala patị ọzọ Image copyright Uche Nwosu

Uche Nwosu bụbu onyeisi ndị ọrụ gọọmentị n'Imo Steeti, ahapụla otu ndọrọ ndọrọ APC mabanye otu Action Alliance.

Nwosu kwuru na n'agbanyeghi nhapụ ọ hapụrụ APC, na nkwado ya ka dị n'ebe Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ n'ịzọ ọkwa na ntuliaka 2019.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption"O nweghi onye ọzọ ka Uche Nwosu mma" - Okorocha

N'ofesi

Ndị ngagharịiwe na mba Fransị Image copyright AFP

Mba Fransị akwụsịla mbuli ego ụtụisi ha tinyere na mmanụ ụgbọala nke buterela ngagharịiwe n'ime izuụka abụọ, rue ọnwa isii.

Praịm Minista mba ahụ bụ Edouard Philippe kwuru na ọ dị oke mkpa ige ntị n'ihe bụ iwe ndị mmadụ.

N'egwuregwu

Jurgen Klopp Image copyright Inpho

Onye nchịkọta otu egwu Liverpool bụ Jurgen Klopp anabatala iwu ego dị nde paụnds asatọ e riri ya maka ịgbaba n'ime ọgbọ egwuregwu.

Klopp kwuru na ọ bụ eziokwu na ọ dara iwu, na ọ pụghị ịgbanarị nke a.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionChimmie Gbugu

Obiano kadoro ikpe nkwumọtọ

Obiano Image copyright GovernorObianoFacebook
Nkenke aha onyonyo Obiano meriri na ntuliaka ha mere n'afọ 2017 we bụrụkwa gọvanọ nke ugboro abụọ

Gọvanọ Obiano nke Anambra steeti akpọla ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ọrụ ikpe nkwumọtọ ka ha wepụta ụsọrọ ga-ahazị ikpe nkwụmọta na steeti ahụ.

Odeakwụkwọ ukwu steeti ahụ bụ Solo Chukwulobelu kwuputere nke an nzụkọ ndị ọrụ na-eru n'okwu emere n'ọnisha.

Ụgbọoloko abụ ngozi ka ọ bụ....?

Image copyright GovernorObianoFacebook
Nkenke aha onyonyo Arụchara ụzọ ụgbọoloko Abuja - kaduna na Julaị 2016

Onyeisi ụlọrụ Nigeria Railway Cooperation bụ Niyi Ali ekwuola na ha n'enyocha otu nwoke gburu onwe ya na ụzọ oloko dị n'Abuja ụnyahụ siri mee.

Otụtụ mmadụ kwụrụ n'akara twitter ha na ọ bụ ụkọ na ụbịam dị na Naịjirịa kpatara ụdị arụ a.

Trump na nwunye ha egbuchapurula Bush

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Trump na nwunye gara ikwanyere George Bush (nnukwu) ukwu ikpeazu

N'ofesi, onyeisi mba Amerika bụ Donald Trump na nwunye ya Melani Trump akwanyela George Bush nke nukwu ugwu ikpeazụ ebe edobere ozu ya na Capitol US.

A ga-edowe ozu George Bush na-akụkụ nwụnye ya na Texas bụ obodo ya ụbọchị Wednesday.

Ndị agha kwaga Borno ozugbo!

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Muhammadu Buhari na ndị isi agha Naịjirịa

Gọọmenti etiti enyela ọchịagha Tukur Buratai iwu ya kwara ngwongwo ya gafee n'ọwaanyụ nke ukwu awusa ka ọ ga mara ebe ya bụ asuruasu dowere akaodo.

Minista na ahụ maka ndị agha bụ Mansur Dan-Ali kwuputara nke a n'Abuja ụnyahụ.

Gee nkeji igbo ebe a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee emume iri ji ndị Arochukwu

Akụkọ ga-amasi gị