Ibori achịtaghị aja n'ikpe na mba UK

Briten ga-akpachi akụnauba

Image copyright Getty Images

Onye bụbụ aka na-achị Delta Steetị bụ James Ibori achịtaghị aja na njem ya ka ụlọikpe na mba Briten kagbuo ikpe amara ya maka mpu na nrụrụaka.

Akụkọ kwuru na Briten ga-amalite atụmatu ịnakọrọ Ibori akụnaụba dị ijeri dọlla a na-echi na o nwetere site na nrụrụ aka ahu eji maa ha ikpe.

Ọkụ okporo mmanụ Agbịdị

Nkenke aha onyonyo Ebe ụzọ mmanụ agbidi si ga.

Ndị omeiwu Naịjirịa ekpebiela ime nchọpụta maka ihe mberede mere n'Abia steeti ebe okporo mmanụ agbidi gbara ọkụ na mpaghara Osisioma.

Sineto Mao Ohuabunwa, so na ndị tinyere ọnu n'okwu a, sị na ọ bụ 'ihi akpachapụghị anya nke ọma butere ọkụ a tara isi ọtụtụ mmadụ.

Akụkọ mba ofesi

Image copyright PA

Ndị oji egbe aga edulala ihe ruru mmadụ iri na asaa mmụọ na mahadum di na Obodo Crimea nke dị n'aka mba Russia

Akụkọ na-eru anyi ntị na-akọwa na ọ bụ otu nwoke dị afọ iri na asatọ ji egbe wakpo ụmụakwụkwọ ibe ya.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Onye gbaburu Manchester United bọọlụ bụ Paul Scholes ekwuola na ocheghi na Romelu Lukaku ga-enyere Manchester aka ịmabute Iko Premier league.

Scholes kwuru na Lukaku ezughi ka eme nkeọma n'otu egwuregwu ndị Manchester United.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOnye na-akọ osikapa Abakaliki

Otu Nzukọ Ụmụnna chọrọ ka ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala za ajụjụ

Image copyright Getty Images

Otu kpọrọ onwe ha Nzukọ Ụmụnna na otu 'Core Federalists' ndị hiwere ọgbakọ, 'Handshake across the Niger,' ekwuola na ha ga-akpọ ụfọdụ ndị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa okpu maka ịza ajụjụ gbasara ebumnuche ha dịka o siri gbasa nhazighari Naijiria nke a kpọrọ "Restructuring'' na bekee.

Bianca ebuola amụma gbasara APGA

Image copyright Bianca Ojukwu/Facebook

Nwunye Emeka Ojukwu bụ Bianca Ojukwu ekwuola na APGA ga-ahụ ihe ha mere onwe ha na 2019 n'ihi etu ntuliaka imeụlọ ha siri gaa.

Bianca na-ebo ndị ndu APGA ebubo aghụghọ na ntuliaka imeụlọ ha mere ebe ya na ụfọdụ ndị so bido pati ahụ dara.

Lee ga-erute INEC na ntuliaka 2019

Image copyright AFP

Ụlọomeiwu Naijiria e binyela aka na-akwụkwọ Bọjet maka inye Inec ihe karịrị ijeri naira nari abụọ, iri anọ na abụọ(N242 maka ime ntuliaka 2019.

Igbo bụ ndụ na Kanada ugbua

Image copyright Getty Images

Kanada nwere mkpebi ọhụrụ na o nweghị mmehie dị n'ise Igbo.

Ọtụtụ mmadụ n'ala ahụ na-ekwu na mkpebi a nwere ike ibute nnukwu nsogbu n'ahụike ndị mmadụ.

Ighalo bụ dike ugbua

Image copyright Getty Images

Ọ bụ eziokwu makana mmeri o nyere Naijiria ụnyahụ n'asọmpị Naịjirịa na Libya emeela ka Naịjirịa buru otu nke mbu n'otu E n'ime asompị AFCON qualifiers a na-agba ugbua.

Naịjirịa na mba ndị ọzọ na Afrika ka na-agba asọmpi a.

Gee nkeji anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption"Anyị ga-edulata nna mụrụ Nnamdi Kanu" - Ikpeazu