David Malpass ga-anọchị anya Jim Yong Kim n'ụlọakụ mba ụwa niile

David Malpass Image copyright @WorldBank/Twitter

N'ozi ụlọakụ ụwaniile bụ World Bank na Bekee zipụrụ site n'akara Twitter ha, ha kwuru na Malpass ga-ebido ọrụ n'ụbọchị Tuusde.

Ha kwuru na mmadụ niile jịkoro aka họpụta ya dịka onye ndụ ụlọakụ ahụ.

Ọ pụtara na David Malpass bụ onye mba Amerịka ga-anọchi anya Jim Yong Kim dịka ọ rituru n'ọkwa n'ọnwa Febụwarị.

Ụmụakwụkwọ LUTH ebee arịrị

Image copyright STEPHEN URUEYE/FACEBOOK
Nkenke aha onyonyo Stephen gụrụchara akwụkwọ na Mahadum Legọs na ngalaba Dọkịnta n'afọ 2018.

Ndị uweojii na Legọs ekwuola na ha anwụchiela mmadụ abụo bụ ndị aka ha dị n'ọnwụ Stephen Urueye.

Ndị uweojii kwukwara na ha amalitela nyocha banyere ọnwụ nwoke ahụ.

Cheta na ọ bụ n'abalị ụnyaahụ ka ndị ohi zuru Stephen ohi ma sụọ ya mma n'ihu ụlọakwụkwọ LUTH dị na Legọs.

Image copyright @dna_xo/Twitter

Ha kwukwara na ọ bịara otu ụbọchị dịka o mechara mmemme ngụcha Mahadum.

Ụmụakwụkwọ ahụ na-eme ngagharịiwe maka na ha na-ekwu na ọ bụghị taa ka ndị omekome bidoro ịmaja na ịwakpo ha.

Nigeria na-arụ ọdọụgbọmmiri ọhụrụ

Image copyright @hadizabalausman

Dịka Hadiza Usman, onyeisi ngalaba n'ahụ maka ọdọụgbọmiri sị gwa ụlọakụkọ Bloomberg, Naijirịa na-arụ ọdọụgbọmmiri miri emi nakwa ọdọ ngwaahịa abụọ iji belata kpachikpachị dị na ọdọụgbọmmiri dị n'Apapa Legọs.

Otu na Lekki Free Trade Zone dị na Legọs.

Nke ọzọ na Badagry dịkwa na Legọs, ebe nke atọ bụ ọdọụgbọmmiri Ibom dị na Akwa-Ibom.

Ụgwọ Naijiria ji akarịala nke afọ gara aga

Image copyright Next Level/Facebook

Ụgwọ Naijiria gbazitere arịala elu site na tarịị Naira iri abụọ na otu na ụma(N21.73trn)ọ bụ n'afọ 2018 gbaruo tarịị iri abụọ na anọ na ụma(N24.39trn) dịka ngalaba na-ahụ maka ijikwa ụgwọ nke a kpọrọ debt Management office siri kwupụta ụbọchị Tọsde n'Abuja.

O jiri pasent 12.25 gafe nke afọ 2018.

APC na-agbagha mpụtara ntuliaka Adamawa,Bauchi na Sokoto

Image copyright @OffícialAPCNg

Otu APC ekwuola na mmeju ntuliaka Inec mere na Bauchi, Sokoto nakwa Adamawa adanyeghị na anya ya dịka ha boro ebubo wuruwuru, tigbuo-zogbu na igo vote, ma kwuo na ha ga-aga ụlọikpe ịdọgha mpụtara ntuliaka ndị ahụ.

Ha kwukwara na ebubo na onye nke ha bụ onye meriri na ntuliaka Gọvanọ na Kwara steeti Abdulrahman Abdulrazaq ji asambodo secondịrị adigboroja bụ akụkọ Mike ejeagha nke ndị e meriri emeri na-akọ.

Ndị uweojii achụọla onye otu ha maka ọnwụ Kayode Johnson

Image copyright Nigeria Police Force/Facebook
Nkenke aha onyonyo Kọmịshọna ndị uweojii na Legọs bụ Zubairu Muazu na nna Kayode Johnson oge ọ gara leta ezinaụlọ ahụ ndị uweojii gburu nwa ha bụ Kayode Johnson

Ndị uweojii Legọs atuọla alo ha achụọ Inspector Olalekan Ogunyemi n'ọrụ uweojii ka e kpechara ya ikpe imeụlọ maka ogbugbu otu nwata nwooke a kpọrọ Kolade Johnson bụ onye a gbagburu ebe ọ na-ekiri oolu na Mangoro na Legos.

Mana a hapụrụ ogbo ya bụ Sergeant Godwin Orji sị ya lawa na ikpe amaghị ya.

Na egwuregwu,

Obi adịghị Danny Rose mma maka ịkpa oke akpụrụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Danny Rose bidoro ịgbara England bọọlụ n'afọ 2016

Danny Rose nke Tottenham kwuru na ike egwu bọọlụ agwụwala ya dịka ikpa oke agbụrụ na-ari ibe ya elu na bọọlụ.

Rose, onye so ndị egwu ball England akwara emo na asompi e ji akwado Euro 2020 nke a gbara na Montenegro tụrụ arịrị na o nweghị ezi ahụhụ a na-enye ndị kpara oke agbụrụ na bọọlụ.

Akụkọ niile dị mkpa taa n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla