Ohaneze Ndigbo: Ipob pụtanụ tụọ vootu ka ụnụ chụpụ ndị ọchịchị ọjọ

Ndigbo Image copyright BBC/Getty Images

Otu Ohaneze ndị Igbo ekwuola na otu ha ka akwụchịm n'onweghị ihe mebiri n'etiti ha.

Osote odee akwụkwọ otu ahụ bụ Chuks Ibegbu gwara BBC Igbo na ha ka akwụsị ike na mkpebi ha na ha ga-eme ngagharị n'akụkụ Naịjirịa ebe ndị Igbo bi iji gwa ha mkpa ọ dị itụ vootu.

Ibegbu kwuru na Ohaneze na-ewepụta ihe ha kpọrọ 'Ohaneze Observers' ka ha kirie ka ntuliaka 2019 si aga.

Ha rịọrọ ka Indigenous People of Biafra bụ Ipob pụta soro tụọ vootu ka ha wee tụpụ ndị ọjọ nọ ọchịchị ugbua.

Cheta na Ohaneze Ndịgbo ekwuola na ha ga-ebido ị gagharị n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche ime ka ndị Igbo mata mkpa ọ dị ka ha soro mee ntuliaka na-abịanụ.

Odee akwụkwọ otu Ohaneze Ndịgbo bụ Chuks Ibegbu kwuru na Ohaneze agaghị achọ ka ndị si mba ọzọ batawa n'obodo ugbua maka ịsonye na ntuliaka.

Ọzọ,

Nkenke aha onyonyo Ndị Ụlọmeiwu na-akwenyere onye otu ha nwụru ugwu

Ụlọomeiwu ukwu enyela iwu ka akwụsị ikpe o wepụrụ n'ụlọikpe ukwu gbasara nkwụsị ọrụ ọkaikpe ukwu, Walter Onnoghen maka ọsọ enyeamaka "National Judicial council" gbatara na ya bụ okwu.

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisioche Sineti Bukola Saraki bụ Yusuph Olaniyonu kwuru na ụlọomeiwu kwuru ka enye NJC ohere ka ha me ihe dị n'ikpe onnoghen.

N'Ofesi,

Image copyright AFP

Ihe ruru mmadụ asaatọ anwụọla n'ọkụ ọgbụgba na-agba n'ụlọ dị na Paris dịka ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe gbasara ọkụ ọgbụgba na mba ahụ si depụta.

Mmadụ iri atọ merụkwara ahụ.

Ndị ọrụ gbata gbata kwuru na ọnụ ọgụ ndị nwụrụ anwụ nwereike ịgbagote.

A mabeghị ihe kpatara ọkụ ahụ.

N'Egwuregwu,

Image copyright PA

Obi adịghị onye nchịkọta otu egwuregwu Liverpool mma bụ Jurgen Klopp maka etu ha si hara iha n'asọmpị ha na WestHam gbara n'abali Februwarị atọ. Nke mere ka ha jiri pointi atọ wee rituo n'ogo ha nọbụ

na tebulu Premier League.

Nkeji taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionMr Raw: Ihe mere m jiri e ji Igbo eme 'rap'