International Criminal Court: Ụlọikpe mbaụwa atọhapụla Laurent Gbagbo

Akụkọ dị mkpa:

Ụlọikpe Hague atọhapụLaurent Gbagbo

Image copyright Getty Images

Ụlọikpe mbaụwa dị na Hague enyela iwu ka atọhapụ onye chịburu mba Ivory Coast bụ Laurent Gbagbo.

Nke a na-abịa ka ọ gachara izụka abụọ e kpebiri n'ikpe amaghị ya n'ebubo mpụ megidere mmadụ e boro ya.

Ndị mmadụ tubọrọ ebe nhọpụta maka Big Brother Naija

Image copyright BB NAIJA
Nkenke aha onyonyo Ndị bịara mmemme nhọpụta BB Naija

Akụkọ na-erute anyị nti kwuru na ndị mmadụ a mabeghị ole ha dị merụrụ ahụ, ebe ụfọdụ tụbọrọ, dịka ndị ntorobia pụtara n'igwe ebe a na-emem nhọpụta maka emume Big Brother Naija agba nke 2019 na steeti ndị e hiwere ya ụbọchị Fraide.

A katọọla ọbịbịa ndị gọvanọ si mba Nijie bịara ikwado Buhari n'achụmnta vootu ya

Image copyright Salisu Yakasai
Nkenke aha onyonyo Gọvanọ Ganduje na ndị gọvanọ si Niger

Onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara mba na mba, bụ Sam Olisa, akatọọla ọbịbịa ndị gọvanọ abụọ si mba Niger bịara Naijira maka achụmta vootu onyeisiala Muhammadu Buhari.

Olisa gwara BBC Igbo na nke na-egosi na Naijiria enweghị ezi nchekwa agbata ya na ndị mba ọzọ nakwa agaghị enwe ntụliaka kwụ ọtọ.

Amerika na-atụ uche maka ọnọdụ chịchị onyekwuoucheya na Naijiria

Image copyright US Consulate

Onye nnochite anya mba Amerika Naijiria bụ Stuart Syminton ekwuola na na mba ahụ na tu uche maka ochichị onyekwuouche ya na Naijiria.

Syminton kwuru nke oge ọ gara ileta onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu n'Abuja. ụbọchị Fraide.

Aha ndị ga-azọ ọchịchị apụtala

Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec ewepụtala aha ndị ga-azọ ọkwa dị iche iche na ntuliaka nke 2019.

Aha gunyere ndị na-azọ ọkwa gọvanọ, omeiwu nke steeti nakwa nke Naijirịa gburuguru.

Pati nọ n'ọchịchị bụ APC enweghị onye nnọchịte anya na Zamfara na Rivers steeti.

Boko Haram wakporo ndịagha

Image copyright Getty Images

Ọdachị jekwuru ndịagha Naịjirịa na mpaghara obodo Dikwa di na Borno steeti ụbọchị Wenesde.

Onye agha ma maka ihe a gwara ulo ntaakụkọ AFP na ndị Boko Haram wakporo ndịagha ka ha si ihu agha ala ma gbuo mmadu asaa n'ime ha.

Emechara chọọ ndị omekome a ọsọ.

N'ofesi,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nzukọ Trump na Kim Jong-Un mere ya mbụ ndị isiala mba Amerịka na Nọt Koria ga-ezukọ

Onye na-anọchịte anya mba Amerịka na Nọt Korea bụ Stephen Biegun ekwuola na ha ekwela nkwa imebi ụlọ mmepụta akụrụmgwa Nuclear ha.

Biegun si na ọ bụ onye na-ekwuru Amerịka n'ihe banyere mmekọ ha n'ụwa dum bụ Mike Pompeo natara nkwa ahụ n'aka ndị Nọt Korea.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

Ego eji atumgbere ndị egwuregwu bọọlụ adaala.

N'oge a n'afọ gara aga nde pum nari anọ na iri atọ anala n'akpa ndị mmadụ, mana ọ bụ nde pum otu nari na iri asatọ ka enwetara.

Gee nkeji a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOkwu Paul Achalla banyere referendum

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a