Wole Soyinka: Agaghị m atụnyere APC maọbụ PDP

Akụkọ dị mkpa:

Wole Soyinka ajụla Buhari, jụ Atiku

Image copyright Getty Images

Onye na-ede akwụkwọ a mara amara bụ Wole Soyinka ajụla Buhari na Atiku maka ọkwa onyeisiala na na ntuliaka 2019.

Soyinka ,onye kwuru nke a n'ọgbakọ e 'Citizen forum' emere na Legọs ụbọchị Tọọzde sị na Naijiria chọrọ ọbara ọhụrụ.

"Oge ụzọ ọhụrụ were anya eruola. Oge onye ahụ pụtara anyị ga-enye ya nkwado."

"Adịghị ama ama, ka m gwa ụnụ ebe m kwụ ka odo onye ọbụla anya: Mụ bụ Wole Soyinka agaghị atụnyere pati abụọ ahụ na-azọ. Ha abụọ kwesịrị ka a jụ ha kpamkpam."

Transparency International: A ga-ekpoju ndịagha na ntuliaka na-abịa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị agha Naịjirịa juru oge e mere ntuliaka gọvanọ n'Osun steeti

Ndị ọkachamara n'okwu ikike diri onye ekwuola na ntuliaka e mere n'Ekiti na Osun steeti n'afọ 2018 nakwa okwu Onnoghen na-arụ aka na a ga-eji Ndiagha mee ntuliaka 2019.

Otu Transparency International kwuru ụbọchị Tọọzde na obi na-eti ha na a ga-ekpoju ndịagha na ntuliaka na-abịa.

Ha kwuru na ntuliaka emerela n'afọ 2018 nakwa ike ndị ndọrọndọrọ ọchịchi ji achụ ka atụnyere ha butere obi otiti ahụ.

Na nkọwa ya otu onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye bụ Ọkaiwu Ifeanyịi Ulumma gwara BBC na ihe ụfọdụ na-eme na Naijiria ugbua ezuorola ndị mmadụ ịtụ uche na a ga-eji ndị agha mee ntuliaka na-abịa.

"Ọ bụ ihe mere na Osun na Ekiti mere egwu ba ndị mmadụ ahụ na-aga egbojupụta ndịagha."

Ulumma gara n'ihu kwuo na okwu Onnoghen nakwa na onyeisiala Muhammadu Buhari bụ ọchịagha sokwa azọ ọkwa ọchịchị soro bute egwu ahụ.

O kọwara na ọghọm dị n'ikpoju ndị agha na oge ntuliaka bụ na ọ ga-eme ka egwu tụọ ụfọdụ ndị mmadụ mee ka ha ghara ịpụta mee ntuliaka.

Ulumma kwuru na dịka e si eme ya n'ofesi, ihe kwesiri bụ naanị ka ndị uweojii soro hụ na udo dị, na enweghị ọgbaghara.

A hụla ụgbọala onyeisioche otu pati APC Abia steeti ahụ a tọọrọ

Image copyright AFP

Ndị uweojii na steeti Abịa ekwuola na ha enwetala ụgbọala Donatus Nwamkpa bụ onyeisioche otu pati APC na steeti ahụ a tọọrọ atọrọ.

Ọnu na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Geoffery Ogbonna kọwara na ha hụrụ ụgbọala a n'okporo ụzọ si Osisioma gaa Ibeku.

Oshoala abanyela otu egwu bọọlụ Barcelona

Ọkaibe na bọọlụ ụmụnwaanyị bụ Asisat Oshola eferela otu egwu bọọlụ Barcelona.

Ọ hapụru otu egwu bọọlụ ndị mba Spen.

Aboubakar Kamara agaala Yeni Malatyaspor

Image copyright Getty Images

N'aka nke ọzọ, otu Fulham ebinyela otu egwu bọọlụ Yeni Malatyaspor onye egwu ha bụ Aboubakar Kamara rue ọgwụgwụ oge a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Atiku Abubakar ga-agbaghara ndị zuru ego Naịjirịa

Image copyright Reuters

Abubakar na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'okpuru PDP kwuru nke a ụnyaaahụ na ogige mkaparịtaụka akpọrọ "The Candidates".

Ọ sị na ọ bụ ụzọ ọ ga-esi nata ijeri naira ọkankụ ndị aka ntụtụ mịpụrụ n'akpa Naịjirịa.

N'otu aka ahụ,

Image copyright EFCC
Nkenke aha onyonyo Otu onye omee iwu a chụrụ n'afọ gara aga bụ Abdulmumin Jibrin bụ onye degara EFCC akwụkwọ gbasara mpụ ahụ

Ikpe banyere nde dọla iri anọ na ọma ahụrụ n'ime ụlọ Orsbone Towers na Legọs ga amalite eche bụ ụbọchị Tọsde, abali mbụ nke ọnwa Febụwarị 2019.

Ndị gọọmentị kpụpụrụ n'ihu ọkpaikpe bụ onye bụbụ onyeisi ngalaba National Intelegence Agency bụ Ayodele Oke na ọrịaku ya.

Onye ọzọ akpụpụkwara ụlọikpe maka ebubo mpụ bụ onyebụbụ ode akwụkwọ gọọmentị bụ David Babachir Lawal.

Juan Guaido chọrọ ka ndị agha chụp Maduro

Image copyright Reuters

Onyeisi pati na-anọghị n'ọchịchi na Venezuela ekwuola na ndi otu ya na ndị agha Venezuela na-enwe nzukọ maka etu ha ga-eji nye aka napụ Onyeisiala mba ahu bụ Nicholas Maduru ọkwa.

Juan Guaido echiele onye ya onyeisiala ma nweta nkwado n'aka mba Amerịka na ụfọdụ mba ndi ọzọ ka ọ nọ na njem ịbụrụ onyeisiala ejighi itu vootu tinye n'ọkwa.

Chelsea ji nkata buru goolu

Image copyright Getty Images

Chelsea ji nkata buru goolu unyaahụ ka otu egwuregwu Bournemouth ji okpụ goolu anọ asatagi ma otu gosi ha na-ejighi ọnụ ama onye ka ike.

N'Itali, Real Madrid nyụkwara Sevile ịkpakwụ ka ha ji ọkpụ goolu isii a satara otu fụọ ha aka n'isi.

Gee nkeji a be a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a