Benjamin Netanyahu ọ ga-achị Israel nke ugboro ise?

Akụkọ dị mkpa taa:

N'ofesi,

Ndị mba Izrel ekwuola na ha ga-eme ntuliaka n'ime ọnwa Epreelụ na-abịa, ebe Benjamin Netanyahu bụ onyeisiala ha na-ele anya ịbụ onyeisiala nke ugboro ise.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Benjamin Netanyahu

Ọ bụrụ na Netanyahu merie ntuliaka a, ọ ga-abụ onyeisiala kacha chịa mba Izrel.

Gịnị na-afịọ n'Anambara?

Haruna Mohammed bụ ọnu na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara, gwara BBC na ọ bụghị eziokwu na ha adịghị aza oku ma a tọrọ mmadụ makana ọ bụ ọrụ ha ịhụ na obodo nwere nchekwa.

Mohammed kwuru okwu a, ka ụfọdụ ụlọntaakụkọ dere na ndị mmadụ n'Umunze, sị na ntọrị na-eme na be ha adịghị enweta enyemaka, dịka o kwesịrị, n'aka ndị uweojii.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ọ bụghi eziokwu na anyị adịghị aza oku ndị Umunze - Uweojii

Ngagharịiwe na Zamfara

Ndị mmadụ bara okporoụzọ taa n'obodo Tsafe dị na Zamfara steeti igosi iwe ha maka ogbugbu mmadụ na mwakpo ndị ọzọ na-eme na steeti ahụ.

Ihe nkiri ndị mmadụ tinyere na Facebook gosiri ọtụtụ mmadụ ji osisi na mma na-aghagharị ma na-ekwu "anyị achọghị".

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Ọgbaghara adaala na Zamfara

N'egwuregwu,

Kedụ ndị na-akwado Arsenal ebe a? Onye egwu bụ Henrikh Mkhitaryan, apụọla n'egwu site n'ụkwụ ọ gbajiri.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mkhitaryan esonyela Danny Welbeck na ndị Arsenal merụrụ ahụ na-agaghị agba bọọlụ n'oge dị anya

Ndị Arsenal kwuru na ọ gaghị agba bọolụ n'ime izu isii, ruo mgbe ọ ga-agbake.

"Depụta ihe niile ị mere mgbe ị bụ gọvanọ"

Onye kwuru nke a.

Ọ bụ ihe ọnụ na-ekwuchitere Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemeodo sara onyeisi otu APC bụ Adams Oshiomhole dịka ha na-ama aka.

Cheta na Oshiomhole katọrọ Rochas Okorocha na mmalite ịchụnta vootu Hope Uzodinma n'Owere.

Ọzọ,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ

Ụmụ mmadụ ataala onyeisiala Buhari ụta, ụfọdụ kpọrọ oku ka akwụsị abụbọọrụ ahụ ebe ndị ọzọ ekwuola na ha ga achọ ọrụ ọzọ dịka otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum akpọrọ ASUU n'aha ịchafụ kwudosi ike na

abụbọọrụ ha ga-aga n'ihu.

Na mba ofesi,

Image copyright AFP/Getty Images

Dịka ala ọmajiji mechara na mba Indonesia, ndịọrụ gbatagbata adọọla ndị biketere mmiri nso ha kwapu n'akụkụ mmiri n'ihi na ibibia mmiri nwereike ịme ọzọ.

Cheta na mmadụ karịrị narị abụọ anwụọla mbụ n'ihe mberede a.

N'egwurewgu,

Thiago Silva abanyela n'ọnụọgụgụ ndị ọgba bọọlụ otu PSG ndị ohi gbakara ụzọ ya mgbe ọ nọ n'ọgbọ egwuregwu.

Ndị uweojii kwuru na ọnụ ihe ezuru na bee ya ruru puku euros ole na ole.

Gee Nkeji nke ụtụtụ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a