Akụkọ dị mkpa taa: PDP adọola Tinubu aka na ntị gbasara ihe o kwuru maka Atiku

Akụkọ ndị dị mkpa

N'etiti PDP na Tinubu

Image copyright Getty Images

Otu PDP adọọla otu isi ahụrụ kwaba okpu ndị APC bụ Ahmed Bola Tinubu aka na ntị ka ọ ghara ịchịpụta onwe ya ụkwụ n'ama site n'ikwu okwu dị an̄aa banyere onye nke ha na-azọ ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakar.

Nke a na-abịa ka Tinubu kwuru sị na ebe ọbụla ọ sọrọ ndị mmadụ ha na-ezute Atiku, na ọ ga-ada ma kwukwaa na APC anaghị atụ ya ụjọ.

Mwakpo Boko Haram

Ndị agha nkịtị na-enyere ndị agha Naịjirịa aka ịlụ ọgụ na mpaghara ugwu-ọwụwaanyanwụ Naịjirịa kwuru na ndị agha nnupuisi Boko Haram wakporo ndị mmadụ na Borno steeti n'abalị ma gbuo ihe ruru iri na ise.

Dịka akụkọ si kwuo, ha wakporo obodo Bulaburin na Kofa nakwa Dalori ebe ha zuru ha ohi ma mụnye obodo ahụ ọkụ.

Na mba ofesi,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kanada na-anabata ọtụtụ ndị na-agba ọsọ ndụ

Kanada na-achọ ịgbara ndị Naịjirịa na-ejighi akwụkwọ ikike bata mba ha ụgbọ nwamkpi.

N'agbanyeghị na ọ bụghi naanị ndị Naịjirịa ka nchụla a metụtara, ọ dị ka ọ bụ ha ka ọ ga-aka metụta makana ndị Naịjirịa karịchara na ndị na-ejighị akwụkwọ nọrọ na Kanada.

N'egwuregwu,

A ga-ebido emume ili onye nwe otu Leicester City nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu n'abalị Satọde gara aga n'Ịngland.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Vichai Srivaddhanaprabha zụtara otu egwuregwu Leicester City n'afọ 2010

A ga-eme emume ili ya rue ụbọchị asaa na mba ebe o si bụ Taịland.

Gere akụkọ niile a n'otu nkeji ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Achọtala ozu Alkali

Image copyright Usman Audu/Nigeria Army

Ndịagha Naịjirịa achọpụtala ozu otu onye ndu ha bụ Mohammed Idris Alkali furu efu kemgbe ọnwa Sepụtemba.

Ndịagha ahụ kwuru na ọ bụ otu onye echere so na ndị gburu ya kpọgara ha n'ebe achọtara ozu nwoke ahụ.

Ọzọ,

Image copyright @Honuchenwosu.JP
Nkenke aha onyonyo Uche Nwosu bụ onyeisi ndị ọrụ na Imo steeti

Rochas okorocha, Uche Nwosu nakwa ndị otu ha ndị ọzọ emeela ngagharị iwe n'Owerri maka ihe ha kpọrọ mkpagbu n'aka ndị isi otu APC

Nke a na-abịa dịka a na-anụ kepu kepu na Okorocha nwereike ịgbalahụ otu APC fere pati ọzọ maka okwu ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu.

Na mba ofesi

Image copyright Reuters

Ndị na-eme nyocha n'ụgbọelu Lion Air dara ada achọtala akpati ojii na-edekọ ihe niile mere n'ime ụgbọelu ahụ tupu ọ daa.

Rue ugbua, achọpụtabeghị onye ọbụla ma haadị ndụ ma ha anwụrụ anwụ n'ihe mberede ahụ.

N'eguwregwu,

Otụ ọgba bọọlụ Naịjirịa nwere ọrụsị apụọla n'asọmpị iko mba ụwa nke ndị nwere ọrụsị na Mexico.

Ha pụrụ n'agbanyeghị na ha meriri mba El- Savador n'ihe bụ asọmpị iko mba ụwa nke mbụ ha.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla