Shonekan ka dị ndụ

Ernest Shonekan ka dị ndụ

Image copyright Bayo Omoboriowo
Nkenke aha onyonyo Shonekan nọ n'etiti Abubakar na Obasanjo

Onye jiburu ọkwa onyeisiala n'oge gara aga bụ Ernest Shonekan ka dị ndụ, ọnweghị anwụ.

Ọdeakwụkwọ gọọmenti Ogun Steeti bụ Taiwo Adeoluwa gwara BBC na Shonekan dị ndụ ma dịkwa gara gara na-akụkọ ọnwa ya bụ asị ọcha.

O kwuru na Shonekan na gọvanọ Ogun Steeti bụ Ibikunle Amosun nwere mkparịta ụka n'oge na-adịghị anya.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Manchester United ga-ele ndị Juventus ọbịa n'asọmpi Uefa Champịọns ebe Ronaldo na Pogba ga-ezute otu egwuregwu ha n'oge gara aga.

N'aka nke ọzọ Real Madrid, Man City, Bayern Munich, Valencia na ndị ọzọ ga-anọ n'egwu n'abalịa

Ọgbaghara Kaduna Steeti

Image copyright @elrufai

Gọọmentị Kaduna steeti ewedatala aka na mmachi njem emere na mpaghara dị iche iche nke Steeti ahụ n'ihi ọgbaghara dapụtara na nso nso a.

Nke a na-abịa dịka ndị isi ọchịchị nchekwa na Steeti mechara ọgbakọ, iji nyocha ọnọdu nchekwa.

Nnamdi Kanu ka bụ onyeisi IPOB - Emmanuel Kanu

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnamdi Kanu ka bụ onyeisi IPOB- Emmanuel Kanu

Emmanuel Kanu bụ nwanne Nnamdị Kanu na e nwere naanị otu IPOB n'ụwa niile nke nwanne ya nwoke bụ onyeisi ha.

Ọ gwara BBC Igbo na ozi ahụ pụtara na soshal midia kwuru na akwatuola Nnamdi Kanu dika onye isi IPOB bụ asi ọcha.

N'ofesi

Onyeisiala mba Turkey bụ Recep Tayyip Erdogan ekwuola na ogbugbu onye ntaakụkọ Jamal Khashoggi bụ nke akpachara anya mee.

O kwuru ka mba Saudi Arabịa zaa ajụjụ ebe ozu nwa amadị ahụ nọ ma kpọọ oku ka ataa ndị gburu ya ahụhụ.

Nkeji n'abalị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIPOB: A taghịm Nnamdi Kanu ụta