Akụkọ ndị dị mkpa taa: Nwaanyị a ga-aka nwoke chịta nke ọma

Akụkọ dị mkpa taa

Na mba ofesi

Ọ pụtara na aka ụmụnwaanyị ka kwụọtọ karia nke ụmunwoke?

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Aisha Mohammed bubu minista na-ahu maka ọrụ tupu onye na-ahụ maka nchekwa

Ọ bụ ihe Praim Minister mba Ethiopia na-ekwu dịka o mere Aisha Mohammed onyeisi ndịọrụ nchekwa mbụ ma nyekwa ụmụnwaanyị ọkwa ọchichị ruru ọkara na gọọmentị ya.

Red Cross ebeela akwa Hauwa Liman.

Onyeisi Red Cross na mpaghara Afrịka bụ Patrcia Danzi ekwuola na ọnwụ Hauwa Liman bụ ihe obi mgbawa

Danzi rịọrọ gọọmentị Naịjirịa ha gbaa mbọ hụ na udiri ihe a emeghị ọzọ.

Image copyright Lere Olayinka
Nkenke aha onyonyo EFCC si na Ayo Fayose ji ha ụgwọ ị zara ọnu.

Aka chịbụrụ Ekiti steeti bụ Ayodele Fayose wụchiri n'ụlọọrụ ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ EFCC taa.

Fayose mere nke a dịka eduru onye nọchịrị anya ya bụ Kayode Fayemi n'iyi ọrụ n'Ekiti taa.

N'egwuregwu,

Otu bọọlụ Madagascar etozuola ịga asọmpị Africa Cup of Nations nke mbụ ha dịka ha meriri otu bọọlụ Equitorial Guinea.

Ndị Super Eagles nke Naịjiria ga-ezute otu boolu mba Libya ta na Tunisha.

Gee Nkeji nke mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

N'ụtụtụ

Aga m ebu akwa ndina gaa n'ụlọọrụ EFCC

Image copyright @GovAyofayose
Nkenke aha onyonyo E meriri onye osote Gọvanọ Fayose bụ Kolapo Olusola-Eleka na ntuliaka gọvanọ e mere n'Ekiti na nso nso a.

Onye bụbu Gọvanọ Ekiti Steeti bụ Ayodele Fasoye ekwuola na ọ ga-ebu ote ya na akwa ndị na niile ya gaa zara ọnụ n'ụlọọrụ ndị na-ebu agha megide mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC.

Cheta na e boro ya ebubo na ọ na-atara ego dị otu ijeri naịra na ọma bụ nke ekwuru onye bụbu onye ndụmaọdụ na nchekwa bụ Sambo Sinatọ Musilu Obanikoro nyere ya.

Ọrụ Fayose dịka gọvanọ gụrụ n'isi ụtụtụ taa nke a mere ikike na-echekwa bụ immunity na bekee ị gaara ọnụ ya gụkwara n'otu aka ahụ.

Naịjirịa akatọọla ogbugbu Leman:

Image copyright @Twitter/ICRC
Nkenke aha onyonyo Ndị Boko Haram gburu onye ọrụ Red Cross bụ Hauwa Leman ka ọ gachara otu ọnwa ka kwụrụ ka atọhapụ ndị otu ha eji eji.

Ụmụ Naịjirịa akatọọla gọọmentị etiti maka ịnọ na mmiri ncha a baa ha anya n'ihi ogbugbu ndị Boko Haram gburu Hauwa Leman onye ọrụ Red Cross.

Cheta Boko Haram tọọrọ Leman na ndị oru ibe ya n'ọnwa Maachị afọ 2018.

Akwamozu nwafọ Igbo uweojii mba Amerịka gburu

Image copyright Getty Images

Taa bụ akwamozu Chinedu Okobi, nwa afọ Igbo dị afọ iri atọ na isii ndị uweojii mba Amerịka gburu n'anyaọcha na mba ahụ.

Nwanne ya bụ Ebele Okobi gwara BBC Igbo na aka nwanne ya dị ọcha, ma kpọkuo mba ụwa ka ha nye ezinaụlọ ha aka inweta ikpe kwụ ọtọ.

N'ofesi

Image copyright AFP

Odeakwụwkọ mba Amerịka bụ Mike Pompeo ga-ezute Eze Salman Amid nke Saudi Arabia taa n'ihi ogbugbu onye ntaakụkọ Saudi a kpọrọ Jamal Khashoggi furu n'ụlọ ọrụ nnọchiteanya ha dị na Turkey.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images

England ji ọkpụ goolu atọ asatara abụọ merie Spain n'asọmpị mba Uefa ha gbara n'abalị

mmeri a bụ mbụ England na-enweta n'aka mba Spain n'ime afọ iri atọ na otu.

Gee Nkeji nke mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOby Ezekwesili: 'M ga-agba mgba dị na ndọrọndọrọ 2019'