Akụkọ dị mkpa taa: Mmadụ 21 anwụọla na Platu steeti

Akụkọ kachasị dị mkpa taa:

Image copyright Getty Images

Okwu anyị nụrụ ugbua bụ na ihe karịrị mmadụ iri abụọ n'otu anwụọla na Plateau steeti mgbe ndị bu egbe wakporo ha na.

Onyeisioche okpuruọchịchị Barkin Ladi bụ Dickson Chollom gwara BBC na ndị ahụ ji egbe malitere ị gba ndị mmadụ egbe n'abali wenzde.

Okwu ntukliaka imeụlọ APC ka na-ewu kwa

Nkenke aha onyonyo Ndị ga-ebinye aka eruola ebe ha ga-eme ntuliaka a n'Enugwu

Ihe pụtara ugbua bụ na kọmiti na-ahụ maka pati APC akagbuola nke emere n'Edo steeti

ebe otu ụlọịkpe n'enugwu jụrụ itinye iwu ga-eme ka akwụsị ntụlịaka imeụlọ APC maka ọkwa gọvanọ n'Enugwu

Na mba ofesi,

Image copyright Getty Images

Otu onye bubu onyeisi otu ndị na-eyi ndụ egwu na Somalia bụ Al Shabab apụtala ịzọ ọkwa ọchịchị n'obodo ahụ.

Mukhtar Robow ga-azọ ọkwa onyeisiala mpaghara ọdịda anyanwụ n'obodo ahụ.

N'egwuregwu,

Cristiano Ronaldo asaala ebubo mwakpo otu nwata nwaanyị boro ya.

Onye ogba bọọlụ a amama depụtara n'akara Twitter ya kwuo na mwakpo nwaanyị bụ ihe megidere ihe niile o kwenyere na ya"

Gee nkeji nke mgbede a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Ndigbo chọrọ

N'ụtụtụ,

Enyimba akpụọla afọ n'ala na CAF

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Enyimba International FC Aba ebuola iko champions league Afrika ugboro abụ ma bukwasakwa ya iko nke Federation kemgbe 2001

Ụmụnna a ọ dịzịka ka Enyimba ana awụzị ka nwa atụrụ na Confederation Cup na-abịanụ.

Raja Casablanca nke Moroco ji otu kpondo seghachie Enyimba aka elekere azụ n'asompi ha gbara n'Aba,ụnyahụ.

Gọmenti etiti sị na ha agaghị etinye ego n'ụkwọ akwụkwọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mahadum Legós

Gọmentị etiti ekwuọla na ọnweghị mgbe ha bụ n'obi iweli ụgbọ akwụkwọ ndị mahadụm.

Odeakwụkwọ ukwu nke ministry na ahụ maka akwụkwọ bụ Sonny Echono kwuputara nke a ụnyaahụ bụ Wenezde n' Abuja.

PDP Enyela Sam Egwu na Chimaraoke ọkọrọtọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo PDP chiburu Naịjirịa afo iri na isii

Chimaraoke Nnamani na Sam Egwu bụ ndị chịburu dịka gọvanọ Enugwu nakwa Ebonyi steeti enwetala ikike ndị PDP ịnọchite mpaghara ha n'ụlọomeiwu ukwu Naijiria.

N'otu aka ahụkwa ka aka chịburu Abia bụ Theodore Orji, Enyinnaya Abaribe, nakwa Mao Ohuabunwa sị nwetakwa ikike pati ahụ na-ịnọchite Abia-Central, Abia South, nakwa Abia- North na ntulika 2019.

Mmadụ 259 anwụọla maka selfie n'ụwa

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nwoke nọ na ugwu na-agbọpụta ọkụ bekee kpọrọ volcano

Ndị ọkammụta achọpụtala na ihe ruru mmadụ narị abụọ na iri ise na itoolu (259) anwụọla ebe ha na-ese onwe ha foto nke bekee kpọrọ selfie site n'afọ 2011 ruo 2017.

Nke a dị n' akwụkwọ nchọpụta a kpọrọ 'Journal of Family Medicine and Primary Care nke Mahadụm ahụike biputata n' Indịa.

Gee nkeji anyị nke tata

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Akụkọ ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionImo state: Madumere bụ nwa m-Okorocha

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a