Hurricane Florence ka na-akpa mkpa mkpa na U.S.

Ipob na ọkwa ịnọ n'ụlọ, kedụ ka ihe siri kwụrụ?

Image copyright Emma Izuchukwu
Nkenke aha onyonyo Enyimba, Aba nọ jụụ tata

Oku Ipob kpọrọ maka icheta ndị otu ha lara mmụọ otumgbe a n'afọ gara aga dị ire n'Ọnịcha, Aba, Nnewi mana ọ kpụrụ afọ n'ala n'Enugwu na Ebonyi steeti dịka akụkọ kọrọ.

Ka ọ dị ugbua ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ jụrụ eju bara abara n'ọtụtụ ebe n'alaigbo.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Godwin Emefiele bụ Gọvanọ ụlọakụ etiti na Naịjirịa

Gọvanọ ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele adọọla aka na ntị maka gbanụ gbanụ e ji abadọ atụmatụ iji otu ego na-azụ ahia n'ọdịda anyanwụ mba Afrịka.

Onye nchịkọba West African Monetary Zone bụ Ngozi Egbuna sị na ndị mba ndị ọzọ enwetezụbeghị ihe a tụrụ anya n'aka ha.

Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ndị ọrụ ụlọmkpọrọ Briten dị 20,000

N'ofesi, ndị ọrụ ụlọ nga na mba Briten emela ngagharị iwe maka mmekpeahụ na mmegbu ndị mkpọrọ na-emeso ha.

Mịnịsịta na-ahụ maka ọrụụlọ ndị nga bụ Rory Stewart sị na ya bụ abụbụ ọrụ ndị ọrụ ya gbara megidere iwu obodo ma kwekwa nkwa na a ga-etinye ọnụ na ya bụ okwụ ụbọchị Monday na-abịanụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Amachiri Marcus Rashford asọmpị atọ dịka achụpụchara ya na asọmpi Man. U na Burnley

Akụkọ kachasị n'ụtụtụ taa

Na mba ofesi

Image copyright Reuters

Ebirimmiri nke a kpọrọ Florence atụọla n'obodo North Carolina na mba Amerịka taa.

Ndị mmadụ gbara ọsọndu nọ n'ọgbọ enyemaka dị icheiche ebe ihe rụrụ ụlọobibi otu puku narị enweghịzị ọkụ latrik.

Na Naịjirịa,

Image copyright Getty Images

Egwu ji ndị mmadụ bi n'ọdịda anyanwụ ugbua maka ihe taa ga-apụta dịka ndị uweojii na-agagharị n'ihe ha kpọrọ ịgosi ike.

Cheta na otu Ipob kpọrọ oku ka ndịgbo nọrọ n'ụlọ iji kwanyere ndị nwụrụ n'egwu eke afọ 2017 ugwu ruru ha.

Ọzọ,

Ndị mmadụ gụnyere gọvanọ chiburu Cross River bụ Donald Duke nakwa sinetọ Ben Murray Bruce akatọọla ọkwa onyeisiala nyere Yusuf Magaji Bichi dịka onyeisi ọhụrụ ndị DSS

Mana nwa Bichi a kpọrọ Abba nọ na-ekele ya siite na akara Instagram ya.

N'egwuregwu

Ụmụ afọ Igbo ato esonyela na ndí nkuzi egwuregwu bọọlụ ga-aga emume "World Remit future stars na London" n'ọnwa oktoba

Ha gụnyere Henry Iwuanyanwu, Ezindu Lawrence nakwa Felix Nwosu.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKofi Annan