Imo State: Uweojii anwụchiela ndị gburu Ụkọchukwu Katọlik

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Aka akpara ndị gburu Ụkọchukwu

Image copyright Getty Images

Ndị uweojii nke Imo Steeti anwụchiela mmadụ abụọ ndị so gbabguo onye ụkọchukwu katọlik bụ Jude Egbom na mọnde bụ abali iri nke ọnwa seputemba.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweoji bụ Andrew Enwerem gwara BBC Igbo na mmadụ abụọ ndị a na onye ụkọchụkwu ahụ si n'otu obodo bụ Nkwere dị n'Imo Steeti.

Enwerem kwuru na ndị a na-enyere ndị uweojii aka, iji chọpụta ndị otu ndị gbara ọsọ, na nyocha na-aga n'ihu ị ma ihe ha kwere gbuo onye ụkọchukwu ahụ.

Naịjirịa alaghachịla n'iji oke ụgwọ - Amina Mohammed

Image copyright Getty Images

Osote odeakwụkwọ ukwu otu United Nation bụ Amina Mohammed ebeela akwa n'ụdị ụgbwọ Naịjirịa ji ugbua dị egwu. O kwuru nke a n'ọgbakọ ndị otu IMF na UN nwere maka mmerikọta nlụbọchi Tuusday.

N'okwu ya ọ si na onye bụbu minista na-ahụ maka ego bụ Ngozi Okonjo-Iweala gbara mbọ ị na-apụta Naịjirịa n'ụgwọ mana ugbua ha banyekwala n'iji ụgwọ ọzọ.

Yakubu Dogara awụfela pati PDP

Image copyright Getty Images

Akụkọ kachasị: Aka akparala ndị gburu Ụkọchukwu

Onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Yakubu Dogara agbala akwụkwọ ịzọ ọkwa ọzọ mana ọgbataghị ya n'aka pati APC.

Kepukepu na-ekwu na ọ bụ n'aka pati PDP ka ọ gbatara ya bụ akwụkwọ.

Na nzaghachi, pati APC kwuru na o jughi ha anya na Dogara agafela PDP, ha kwuru na ọdịla anya ọkpawara agwa megidere pati APC.

Egbuola ọtụtụ ndị gara ịgba nkiri na Zamfara Steeti

Image copyright AFP

Ndị oji egbe kpọpere mgbọ egbe ha n'etiti igwe mmadụ bụ ndị gara ile ihe nkiri n'ụlọ nkiri bụ Cinema dị n'otu obodo na Zamfara Steeti.

Mwakpo a bụ nke mere n'abalị ụnyaahụ tara isi mmadụ iri na otu ma merụọ ihe karịrị mmadụ iri abụọ ahụ.

Akụkọ si mba ofesi

Image copyright AFP

Mba ụwa niile gbakọtara ọnụ taa na mba Ghana ịkwanyere Kofi Annan bụbu onye odeakwụkwọ United Nation ugwu nke ikpeazụ n'emume olili ya.

Cheta na Koffi Annan nwụrụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2018 dịka ọ gbara afọ iri asatọ.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Onyeisioche Manchester City bụ Khaldoon Al Mubarak ekwuola na njem ndị otu ahụ amalitebeghi agbanyeghi ego nweta ha karịrị nde narị Yuro ise.

Man City so n'ime otu egwuregwu abụọ na mba Ịngland na-enweta ụdị ọnụ ego ahụ.

Nkeji nke abalịa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri nke taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionKofi Annan