Ipob sị ka e mee nchọpụta maka ogbubu ndị otu ha

Onye Ipob Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Ipob sị na ha chọrọ ka ekewa Naịjirịa

Otu na-acho ka e kewanye ha mba ha kpọrọ Biafra site na Naịjirịa bụ Indigenous People of Biafra (IPOB) akpọkuola mba ofesi ka ha bịa mee nyocha maka ogbugbu ha sị metụtara ndị otu ha.

Ipob sị na oku a ha na-akpọ bu maka "ozu mmadụ 38" ha si ha hụrụ n'obodo Obiawom, nke dị n'Ogwe n'okpuru ọchịchị Ukwa West dị n'Abịa steeti.

Ha kwuru nke a n'akwụkwọ odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Emma Powerful zigara ndị ntaakụkọ.

N'okwu ndị Ipob, ndị a nwụrụ mgbe ndị agha Naịjirịa mere atụmatu nchekwa obodo ha kpọrọ "Egwu Eke" n'afọ gara aga.

Ipob na-ekwukwa na ha chọrọ ka ndị ndọrọndọrọ kwadoro atụmatụ ahụ zaa aziza maka ndị nwụrụ.

Cheta na ndịagha Naịjirịa gọọrọ aka na ụkwụ na ha egbụghị mmadụ n'atụmatụ Egwu Eke ahụ, ma kwukwa na ha awakpoghi be Nnamdi Kanu, bụ onyeisi ndị Ipob.

Mana, mgbe ihe mere, ndị mmadụ gosiri foto na ihe nkiri ụfọdụ na-atụ aka na o nwere ndị nwụru mgbe ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: