Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Orji Kalu kwụsiri ike na APC

Akụkọ ndị dị mkpa

Image copyright Orji Kalu/Facebook

Orji Uzor Kalu bụ aka chịbụrụ Abia steeti ekwuola na kama ọ ga banye otu PDP o sepu aka n'ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị

O kwuru nke a dịka onyeisioche ụlọomeiwu sineti na ndị ọzọ hapụrụ APC gafere na PDP.

#Asaba2018

Ihe ruru ndị egwuregwu narị atọ atọọla na ọdọụgbọelu nke Legos ebe ha na ga Asaba maka asọmpị African senior athletics championships nke kwesiri ibido taa.

BBC ga-agba mbọ ị chọpụta ma ha emechara ruo Asaba maka asọmpị a dịka ha na-ekwu na ha enwebeghi ohere ị kwado ọfụma.

Na mba ofesi

Akụkọ apụtala na mba Kenya na ekwu na sekondrị na Moi Girls High School gwara agwara ụmụakwụkwọ ndị emere mwakpo ha saa ahụ mara na mwakpo mere ha abụghị ihe ukwu

Onye odeeakwụkwọ n'ihe gbasara agụmakwụkwọ bụ Amina Mohammed gwara ndị omeiwu na mba Kenya nke a mgbe ha gbara ya ajụjụ ọnụ maka ihe a mere

N'egwuregwu,

Image copyright @BBCMOTD
Nkenke aha onyonyo Alex Iwobi bụ onye mbụ na-enye mba England goolu na Naịjirịa

A na atụ anya na Victor Moses na Alex Iwobi ga-asọkọta mpi dịka otu egwuregwu ha bụ Chelsea na Arsenal ga-ezute onwe ha n'ọgbọ egwuregwu bọọlụ Aviva dị na Dublin.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionOriri Ịgwa nshị n'Eke ejikọtala obodo niile ọnụ.