Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: Amanyela Facebook iwu ikwụ pound 500,000

Akụkọ ndị dị mkpa.

Buhari akatọọla ndị na-ata ya ụta

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Mohammadu Buhari akatọọla okwu ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchị na-ekwu na ọgbara nkịtị n'ihe gbasara ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa.

Buhari kwuru nke a n'ọgbakọ ndọrọ ndọrọ ndị APC mere n'Ekiti Steeti ụnyaahụ iji kwado kayode Fayemi ịbụ gọvanọ steeti ahụ.

Ụka Angịlịkan adụọla Buhari ndụmaọdụ

Image copyright Anglican communion
Nkenke aha onyonyo Ụka Angịlịkan nọ na mba karịrị otu narị iri isii na ise n'ụwa niile

Ndị ụka Anglican nke Nnewi Dayọsis agwala onyeisiala Buhari ka o chegharịa echiche n'atụmatụ ya ị pụtagharị n'ọkwa ọzọ.

Nke a dị n'ozi ụkọchukwu Godwin Okpala wepụtara kwuo na ụfọdụ na-ahụ ya dịka ogbunigwe nchere oge.

United Kingdom ga-eri Facebook iwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Cambridge Analytica bụ ụlọọrụ mba Britain na-ahụ maka ichekwa ozị

Ngalaba na-ahụ maka nchekwa data na United Kingdom ga-eri ụlọọrụ Facebook iwu ego ruru paụnds puku narị ise maka ị da iwu nchekwa data

Kọmishọna na-ahụ maka ozi kwupụtara nke a mana ụlọọrụ Facebook kwuru na ha ga-asa okwu n'oge na-adịghị anya.

Egwuregwu:

Image copyright Getty Images

Gee nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Ụmụnwaanyị bụ ndị na-ejekarị ebe a na-eburu ha amụma' - Bishop Chukwuma