Ndị na-anya ụgbọala na-ebu mmanụ ajụla ibu mmanụ

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Buhari ga-azọ na ntuliaka imeụlọ APC

2019 na ha ebiri ọkụ o! Onyeisiala Muhammadu Buhari anatala akwụkwọ igosi ebumnobi ya ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'okpuru pati APC.

Image copyright Bashir Ahmad/ Twitter

Otu kporo onwe ha National Consolidation Ambassadors Network (NCAN) bụ ndị gbatara ya akwụkwọ ahụ ma wegara ya n'ụlọ ya n'Abuja taa.

Ụkọ mmadụ nwereike ibido

Mpitimpi ga-ekwe ma ọbụrụ na onweghi ihe e mere gbasara ndị ọrụ mmanụ ụgbọala na-achọ ịgba abụbọ ọrụ.

Image copyright Getty Images

Akụkọ apụtala na mmanụ ụgbọala nwereike ịkọ maka na otu ndị na-anya ụgbọ na-ebu mmanụ ahụ n'ime otu Nupeng ajụla iburu mmanụ n'ọdọ mmanụ dị icheiche na Legos.

Kofi Annan alọrutela Gana

Ụmụ Gana na-akwụ n'ahịrị kamgbe ụtụtụ ileta ozu dike ukwu ha lara mmụọ bụ Kofi Annan.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kofi Annan, bụ onye isi ojii Afrịka mbụ chịrị 'United Nations'

Annan bụbu onyeisi otu UN nwụrụ n'ọnwa Ọgọstụ na mba Swizalnd mana e bulatara ozu ya na mba ya bụ Gana taa.

A daala Marcelo Real Madrid nha

Amaala onye na-agbara Real Madrid bọọlụ bụ Marcelo ikpe ịga mkpọrọ ọnwa anọ na ịkwụ ego dị puku narị Yuro asa na iri ise maka akwụghị ụtụisi na mba Spen.

Image copyright Getty Images

Marcelo ekwetela ịkwụ ya bụ ego mana ka e wepụrụ ya ntaramahụhụ ịga mkpọrọ.

Nkeji nke mgbede a

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ndị ụka katọlik sị na agaghị akwụ ndị ntọ ụgwọ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Nke abụghị mbụ a na-atọ ndị ụka fata na Naịjirịa

Ụlọụka ndị fada bụ nke katọlik akpọọla ekwo nkụ na ha agaghị akwụ mkpa n'aka maka ndị ntọ ịhapụ Rev. Christopher Ogaga bụ onye a nwụchiri na Delta Steeti.

Most Rev. Paulinus Ezeokafor bụ onye kwuru nke a n'Ọka ụnyaahụ gwara ndị ntọ ahụ ha wepụ akpịrị ha n'ego nde naịra iri na ise (15) ha na-ana ụka.

Orji Uzo Kalu agaghị ụlọikpe ụnyaahụ

Image copyright Orji Uzo Kalu/Facebook
Nkenke aha onyonyo Na nsonso a, EFCC kpofuru ebubo na Orji Uzo Kalu mefuru nde kwuru nde naira oge ọ chịrị Abia dịka Govanọ na pati PDP

N'aka ọzọ, ụlọikpe ukwu dị na Legọs abaarala Orji Uzo Kalu oke mba maka ịgbahapụ oku a kpọrọ ya ụnyaahụ.

Orji Uzo Kalu kwesịrị ịbịa zara ọnụ ya n'ebubo ihe karịrị ijeri naịra asaa (7) na ụma a na-ebo ya.

Ọkaikpe ukwu ya bụ okwụ dị n'aka bụ Justice Mohammed Idris sị na Orji Kalu gbara agwa ka ofogori.

ICC sị na ha ga-ekpe US Ikpe

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo US esoghi n'otu ICC

N'ofesi, mba US eforola ntutu taa na ha ga-amapụ ụlọikpe ukwu na-ahụ maka mpụ na mbaụwa ma ọ bụrụ na ha nwaa anwaa kpee ndị agha US ikpe.

John Bolton bụ odeakwụkwọ maka nchekwa obodo mba US kwuru nke a n'ịsa okwu ya bụ ụlọikpe maka echiche ha, ikpe ndị ọbụla dara iwu e ji alụ agha nke mbaụwa n'Afganịstan, ọbụnadị US.

N'egwuregwu,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Henry Kane nke England enyela golu 14 n'ime ugboro 14 ọ gbagoro bọlụ

N'egwuregwu, Ingland na Swizaland ga-asọmpi enyi na enyi tata ma ọ kụọ elekere asatọ nke abalị Septemba 11 nke 2018, na King Power stadium nke dị n'Ingland.

Henry kane agaghị eso sọọ ya bụ mpi.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri taa

Ndị ọchịchị ejighị ntị anụ aha Charles ogbu. Ha na ahụta Ogbu ka nwanza rijuru afọ bịara chi ya mgba. Ya kpatara femi Adesin jiri sị na ya agaghị asa ya okwu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionCharles Ogbu sị na Onyeisiala bụ odibo ndị Naịjirịa

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a